+ All Categories
Home > Documents > IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA …€¦ · oke onu ahia, nke e ji odu mee, na-eri...

IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA …€¦ · oke onu ahia, nke e ji odu mee, na-eri...

Date post: 18-Oct-2020
Category:
Upload: others
View: 2 times
Download: 0 times
Share this document with a friend
4
IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA MERICI PARISH, BRONX, NEW YORK. SUNDAY BULLETIN 26 TH SUNDAY IN ORDINARY TIME (YEAR C) SUNDAY, SEPTEMBER 25, 2016 HYMNS: ENTRANCE: K’ANYI JEE N’ULO CHUKWU OFFERTORY:EKENE ONYE KEL’UWA/CHIDIMMA/WETA… CONSECRATION: JESU AGBADATAGO N’ALTAR COMMUNION: NRIOMA REFLECTION: WE PRAISE YOUR NAME DISMISSAL: VIRGIN MARIA NNE DI NSO
Transcript
Page 1: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA …€¦ · oke onu ahia, nke e ji odu mee, na-eri anu nwa aturu di mma, na anu umu ehi gbara abuba. Unu na-abu abu nke na-abaghi n’ihe

IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF

NEW YORK,

AT ANGELA MERICI PARISH,

BRONX, NEW YORK.

SUNDAY BULLETIN

26TH SUNDAY IN ORDINARY TIME

(YEAR C)

SUNDAY, SEPTEMBER 25, 2016

HYMNS:

ENTRANCE: K’ANYI JEE N’ULO CHUKWU

OFFERTORY:EKENE ONYE KEL’UWA/CHIDIMMA/WETA…

CONSECRATION: JESU AGBADATAGO N’ALTAR

COMMUNION: NRIOMA

REFLECTION: WE PRAISE YOUR NAME

DISMISSAL: VIRGIN MARIA NNE DI NSO

Page 2: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA …€¦ · oke onu ahia, nke e ji odu mee, na-eri anu nwa aturu di mma, na anu umu ehi gbara abuba. Unu na-abu abu nke na-abaghi n’ihe

UKWE MBATA

Onyenweanyi, ihe nile ahu I meere anyi, I jiri

ikpe mkwumoto mee anyi ha, n’ihi na anyi

emehiele Gi; biakwa nupu isi n’iwu Gi. Ma bia

nye aha Gi otito, ka I meere anyi ebere dika

nnukwu ebere Gi si di.

EKPERE MMEGHE

Chineke anyi, na nnukwu ebere na mgbaghara

Gi ka I na-egosi ike Gi puru ime ihe nile. Biko

hukwasa anyi amara Gi n’akwusighi akwusi.

Nyere anyi aka ka anyi were oso na-agbaga na

nkwa I kwere anyi, wee bia keta oke n’anuri nke

eluigwe. Site na Dinwenu anyi.

IHE OGUGU NKE MBU EMOS 6:1. 4-7

Isi Okwu: Ndi na-ebitoghari ndu na ndi na-

abughari abu na-enweghi isi ka a ga-achupu,

zilaa mba ozo.

Dinwenu puru ime ihe nile na-asi: Ahuhu diiri

ndi ahu na-ebi ndu n’ime Zayon, na ndi ahu

chere na ihe ojoo enweghi ike irute ha n’ebe ha

no n’ugwu Sameria. Unu na-edina n’elu akwa di

oke onu ahia, nke e ji odu mee, na-eri anu nwa

aturu di mma, na anu umu ehi gbara abuba.

Unu na-abu abu nke na-abaghi n’ihe mgbe unu

na-anu uda ubo akwara, na-eme onwe unu di ka

unu bu ndi oka ibu abu dika Devidi. Unu na-anu

ihe onunu site n’oba; na ete onwe unu mmanu

makarisiri mma, ma ila n’iyi nke Josef adighi

ewute unu. N’ihi ya, unu aghaghi ibu ndi a ga-

ebu uzo mee ka ha jee biri n’ala ndi ozo. Na

mberede, oke oriri unu na ndina ala unu ga-

akwusi.

Okwu nke Oseburuwa.

Ekele diri Chukwu.

ABUOMA NA AZIZA YA 145:6-10 Az. 2

Aziza: Mkpuruobi m nye Onyenweanyi otito.

1. O bu Dinwenu na-emezu nkwa O kwere

ruo mgbe ebighi ebi; O na-ekpe ikpe ziri

ezi nye ndi a na-emegbu emegbu ikpe.

O na-enye ndi aguu na agu nri.

Onyenweanyi na-atohapu ndi e ji eji na

mkporo. Aziza.

2. Onyenweanyi na-emeghe any ndi kpuru

isi. O na-ekulikwa ndi ibu ha na-

anyigbu, nyekwara ha aka.

Onyenweanyi huru ndi ezi omume

n’anya. Onyenweanyi na-echebe ndi

obia. Aziza.

3. Onyenweanyi na-ekulite nwamgbei na

nwanyi isimkpe, ma O na-eme ka uzo

ndi ajo omume gbagoo agbagoo.

Onyenweanyi ga-achigide ruo mgbe

ebighi ebi. Zayon, Chineke gi ga-esi na

ndudugandu chiruo na ndudugandu.

Aziza.

IHE OGUGU NKE ABUO TIMOTI 6:11-16

Isi Okwu: Mee ihe nile e tiiri Gi n’iwu ruo mgbe

Onyenweanyi Jesu Kristi ga-abia ozo.

Ma n’aka nke i ji buru onye nke Chineke, choba

ezi omume na ikwuba aka oto, okwukwe,

ihunanya, ikwudosi ike, na idi nwayoo n’obi.

Lusiwe ogu oma nke okwukwe ike. Jidesiekwa

aka ike na ndu ebighebi, nke bu uru di n’oku

akporo gi, mgbe i noro n’ihu oha na eze ahu

gbaa akaebe, kwupute okwukwe gi ahu di ogo.

N’ihu Chineke, Onye na-enye ihe nile ndu; na

n’ihu Jesu Kristi, Onye gbaara okwukwe anyi

ahu di ogo akaebe n’ihu Pontios Pailet, ana m

agwa gi ka i kwuba aka gi oto, na-edebe iwu

Chineke, n’ebuteghi mmeru, ka a ghara ita gi

uta o bula, wee ruo mgbe Onyenweanyi Jesu

Kristi ga-aputa ihě.

Page 3: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA …€¦ · oke onu ahia, nke e ji odu mee, na-eri anu nwa aturu di mma, na anu umu ehi gbara abuba. Unu na-abu abu nke na-abaghi n’ihe

Iputa ihě nke a bu nke Chineke ga-egosi anyi,

mgbe oge ahu O kara aka ruru. Ya bu Chineke,

bu Onye ahu di ngozi, Onye ahu nani ya na-achi

ihe nile, Eze nke ndi eze, Onye nwe ndi nwe

mmadu. So Yan we anwu anwu. O bi n’ihe bu

agaru agaru; Onye mmadu na-ahubeghi, ma o

bu mmadu na-apughi ihu! Otito na nsoputu na

ike ochichi ebighi ebi diri Ya! Amen!

Okwu nke Oseburuwa.

Ekele diri Chukwu.

ALELUYA

Aleluya, aleluya! Ngozi diri Eze ahu biara n’aha

Onyenweanyi, udo diri uwa! Ebube diri igwe.

Aleluya!!

OZIOMA LUKE 16:19-31

Isi Okwu: Chetakwanu na n’oge ndu gi, i

natara ihe oma, ebe Lazaros natara ihe ojoo.

Jesu gwara ndi Farisii: E nwere otu ogaranya na-

eyi uwe mara mma, na-erikwa nri di mma

ubochi nile. Ma e nwekwara otu nwogbenye,

onya zuru ahu, a na-akpo Lazaros, na-atogbochi

n’onu-uzo esi abanye n’ulo ogaranya ahu. Ihe o

choro bu ka a tupuru ya o buladi iberibe nri si

n’oche nri ogaranya ahu dapu. Nkita na-abia,

na-aracha ony ahu juru ya n’ahu. Mgbe

nwogbenye ahu nwuru, ndi mmuoma buuru ya,

buga n’eze obi Ebraham. Ogaranya ahu

biakwara nwuo, e lie ya. Ebe ogaranya ahu no,

na-ahuju anya n’oku mmuo, ka osiri letia anya,

hu Ebreham n’ebe di anya; biakwa hu Lazaros

ka o no n’eze obi ya. O tiri mkpu si: “Nnaa

Ebraham! Biko, meere m ebere zite Lazaros, ka

o detu onunu mkpisi aka ya na mmiri, bia detu

m n’ire, mejuo ire m! N’ihi na oku no ebe a

eregbuola m!”

Ma Ebraham zara ya: ‘Nwa m! Chetakwa na

mgbe i di ndu n’uwa, i bu onye uwa oma, ma

Lazaros bu onye uwa ojoo! Ma ugbu a, ihe

asughariala! A na-akasi ya obi, ebe i no na nhuju

anya! Ma o gwubeghi! E nwere nnukwu oke

olulu kewara anyi na unu; Mmadu o bula

enwekwaghi ike isite n’ebe a bia n’ebe unu no,

o dikwaghi onye nwere ike isite n’ebe unu no

bia n’ebea’ Ma ogaranya ahu siri Ebraham:

‘Ebe o di otu a, biko, Nna m, ana m ario gi, ka i

ziga Lazaros n’obi nna m. N’ihi na enwere m

umunne ise. Biko, ya gaa, doo ha aka n anti, ka

ha ghara iso m bata na nhuju anya a’. Ma

Ebraham siri ya: ‘Mosisi na ndi amuma no ebe

ahu. Umunne gi, ha too nti n’ala na nkuzi

Mosisi na nke ndi amuma.’ Ma ogaranya ahu

zara: ‘Nna m Ebraham, mba nke ahu agaghi ezu!

A sin a e nwee onye si na ala mmuo gaa, gwa ha

okwu, ha ga-echeghari.’ Ma Ebreham, zara ya:

‘O buru na ha anughi nke Mosis na ndi amuma

kwuru, echeghi m na ha ga-echeghari ma

mmadu site n’onwu bilie bia gwa ha okwu.

Ozioma nke Oseburuwa.

Otito diri Gi, Kristi.

EKPERE NHUNYE

Chineke Onye ebere, nara onynye anyi na-

ebutere Gi. Biko mee ka o megheere anyi uzo

ebe ngozi Gi nile si abiara anyi. Site na Kristi

Onyenweanyi.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO

Onyenweanyi, biko mee ka ahu na obara Nwa

Gi nke anyi ji akwu ugwo maka njo anyi buuru

anyi ihe nzoputa nke ahu na mkpuruobi. Ka

anyi soro keta oke n’otito Ya, ebe anyi so na-

ekwuputa onwu Ya n’uwa a. Site na Kristi

Dinwenu anyi.

Page 4: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA …€¦ · oke onu ahia, nke e ji odu mee, na-eri anu nwa aturu di mma, na anu umu ehi gbara abuba. Unu na-abu abu nke na-abaghi n’ihe

LAZARUS AND DIVES, THE RICH MAN

The story of Lazarus and Dives, the rich man is not something strange and new to us. Often times, people look at it as something that happened far away in a distance town and in ancient time but we have many Lazarus and Dives around us. We tend to ignore and look the other way

when we see our neighbors go through hard times and needs some support from us. We become Dives due to our stingy and miserly attitude towards our siblings, friends and

colleagues. We are too engrossed with feasting and gallivanting with our club members and those who are in our socialite life. Those who have all the fun in the world now should not

expect to inherit the kingdom of heaven and continue their luxurious life style. People steal from others and extort them in other to enrich themselves and engage in merry making. The love of money is the root of all evils. (1Tim6:10) This is rightly so as we see people engage in

fraud, do drugs and do dirty deals in order to become rich. If God bless us with wealth He expects us to use our wealth to serve others and help the many Lazarus around us. "Be

generous to the poor orphans and those in need. The man to whom our Lord has been liberal ought not to be stingy. We shall one day find in Heaven as much rest and joy as we ourselves

have dispensed in this life." Saint Ignatius. May God help us to be willing to share our resources with those who come to us for help.

Happy Sunday!!

Produced by ICC Choir


Recommended