IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF
NEW YORK,
AT ANGELA MERICI PARISH,
BRONX, NEW YORK.
SUNDAY BULLETIN
26TH SUNDAY IN ORDINARY TIME
(YEAR C)
SUNDAY, SEPTEMBER 25, 2016
HYMNS:
ENTRANCE: K’ANYI JEE N’ULO CHUKWU
OFFERTORY:EKENE ONYE KEL’UWA/CHIDIMMA/WETA…
CONSECRATION: JESU AGBADATAGO N’ALTAR
COMMUNION: NRIOMA
REFLECTION: WE PRAISE YOUR NAME
DISMISSAL: VIRGIN MARIA NNE DI NSO
UKWE MBATA
Onyenweanyi, ihe nile ahu I meere anyi, I jiri
ikpe mkwumoto mee anyi ha, n’ihi na anyi
emehiele Gi; biakwa nupu isi n’iwu Gi. Ma bia
nye aha Gi otito, ka I meere anyi ebere dika
nnukwu ebere Gi si di.
EKPERE MMEGHE
Chineke anyi, na nnukwu ebere na mgbaghara
Gi ka I na-egosi ike Gi puru ime ihe nile. Biko
hukwasa anyi amara Gi n’akwusighi akwusi.
Nyere anyi aka ka anyi were oso na-agbaga na
nkwa I kwere anyi, wee bia keta oke n’anuri nke
eluigwe. Site na Dinwenu anyi.
IHE OGUGU NKE MBU EMOS 6:1. 4-7
Isi Okwu: Ndi na-ebitoghari ndu na ndi na-
abughari abu na-enweghi isi ka a ga-achupu,
zilaa mba ozo.
Dinwenu puru ime ihe nile na-asi: Ahuhu diiri
ndi ahu na-ebi ndu n’ime Zayon, na ndi ahu
chere na ihe ojoo enweghi ike irute ha n’ebe ha
no n’ugwu Sameria. Unu na-edina n’elu akwa di
oke onu ahia, nke e ji odu mee, na-eri anu nwa
aturu di mma, na anu umu ehi gbara abuba.
Unu na-abu abu nke na-abaghi n’ihe mgbe unu
na-anu uda ubo akwara, na-eme onwe unu di ka
unu bu ndi oka ibu abu dika Devidi. Unu na-anu
ihe onunu site n’oba; na ete onwe unu mmanu
makarisiri mma, ma ila n’iyi nke Josef adighi
ewute unu. N’ihi ya, unu aghaghi ibu ndi a ga-
ebu uzo mee ka ha jee biri n’ala ndi ozo. Na
mberede, oke oriri unu na ndina ala unu ga-
akwusi.
Okwu nke Oseburuwa.
Ekele diri Chukwu.
ABUOMA NA AZIZA YA 145:6-10 Az. 2
Aziza: Mkpuruobi m nye Onyenweanyi otito.
1. O bu Dinwenu na-emezu nkwa O kwere
ruo mgbe ebighi ebi; O na-ekpe ikpe ziri
ezi nye ndi a na-emegbu emegbu ikpe.
O na-enye ndi aguu na agu nri.
Onyenweanyi na-atohapu ndi e ji eji na
mkporo. Aziza.
2. Onyenweanyi na-emeghe any ndi kpuru
isi. O na-ekulikwa ndi ibu ha na-
anyigbu, nyekwara ha aka.
Onyenweanyi huru ndi ezi omume
n’anya. Onyenweanyi na-echebe ndi
obia. Aziza.
3. Onyenweanyi na-ekulite nwamgbei na
nwanyi isimkpe, ma O na-eme ka uzo
ndi ajo omume gbagoo agbagoo.
Onyenweanyi ga-achigide ruo mgbe
ebighi ebi. Zayon, Chineke gi ga-esi na
ndudugandu chiruo na ndudugandu.
Aziza.
IHE OGUGU NKE ABUO TIMOTI 6:11-16
Isi Okwu: Mee ihe nile e tiiri Gi n’iwu ruo mgbe
Onyenweanyi Jesu Kristi ga-abia ozo.
Ma n’aka nke i ji buru onye nke Chineke, choba
ezi omume na ikwuba aka oto, okwukwe,
ihunanya, ikwudosi ike, na idi nwayoo n’obi.
Lusiwe ogu oma nke okwukwe ike. Jidesiekwa
aka ike na ndu ebighebi, nke bu uru di n’oku
akporo gi, mgbe i noro n’ihu oha na eze ahu
gbaa akaebe, kwupute okwukwe gi ahu di ogo.
N’ihu Chineke, Onye na-enye ihe nile ndu; na
n’ihu Jesu Kristi, Onye gbaara okwukwe anyi
ahu di ogo akaebe n’ihu Pontios Pailet, ana m
agwa gi ka i kwuba aka gi oto, na-edebe iwu
Chineke, n’ebuteghi mmeru, ka a ghara ita gi
uta o bula, wee ruo mgbe Onyenweanyi Jesu
Kristi ga-aputa ihě.
Iputa ihě nke a bu nke Chineke ga-egosi anyi,
mgbe oge ahu O kara aka ruru. Ya bu Chineke,
bu Onye ahu di ngozi, Onye ahu nani ya na-achi
ihe nile, Eze nke ndi eze, Onye nwe ndi nwe
mmadu. So Yan we anwu anwu. O bi n’ihe bu
agaru agaru; Onye mmadu na-ahubeghi, ma o
bu mmadu na-apughi ihu! Otito na nsoputu na
ike ochichi ebighi ebi diri Ya! Amen!
Okwu nke Oseburuwa.
Ekele diri Chukwu.
ALELUYA
Aleluya, aleluya! Ngozi diri Eze ahu biara n’aha
Onyenweanyi, udo diri uwa! Ebube diri igwe.
Aleluya!!
OZIOMA LUKE 16:19-31
Isi Okwu: Chetakwanu na n’oge ndu gi, i
natara ihe oma, ebe Lazaros natara ihe ojoo.
Jesu gwara ndi Farisii: E nwere otu ogaranya na-
eyi uwe mara mma, na-erikwa nri di mma
ubochi nile. Ma e nwekwara otu nwogbenye,
onya zuru ahu, a na-akpo Lazaros, na-atogbochi
n’onu-uzo esi abanye n’ulo ogaranya ahu. Ihe o
choro bu ka a tupuru ya o buladi iberibe nri si
n’oche nri ogaranya ahu dapu. Nkita na-abia,
na-aracha ony ahu juru ya n’ahu. Mgbe
nwogbenye ahu nwuru, ndi mmuoma buuru ya,
buga n’eze obi Ebraham. Ogaranya ahu
biakwara nwuo, e lie ya. Ebe ogaranya ahu no,
na-ahuju anya n’oku mmuo, ka osiri letia anya,
hu Ebreham n’ebe di anya; biakwa hu Lazaros
ka o no n’eze obi ya. O tiri mkpu si: “Nnaa
Ebraham! Biko, meere m ebere zite Lazaros, ka
o detu onunu mkpisi aka ya na mmiri, bia detu
m n’ire, mejuo ire m! N’ihi na oku no ebe a
eregbuola m!”
Ma Ebraham zara ya: ‘Nwa m! Chetakwa na
mgbe i di ndu n’uwa, i bu onye uwa oma, ma
Lazaros bu onye uwa ojoo! Ma ugbu a, ihe
asughariala! A na-akasi ya obi, ebe i no na nhuju
anya! Ma o gwubeghi! E nwere nnukwu oke
olulu kewara anyi na unu; Mmadu o bula
enwekwaghi ike isite n’ebe a bia n’ebe unu no,
o dikwaghi onye nwere ike isite n’ebe unu no
bia n’ebea’ Ma ogaranya ahu siri Ebraham:
‘Ebe o di otu a, biko, Nna m, ana m ario gi, ka i
ziga Lazaros n’obi nna m. N’ihi na enwere m
umunne ise. Biko, ya gaa, doo ha aka n anti, ka
ha ghara iso m bata na nhuju anya a’. Ma
Ebraham siri ya: ‘Mosisi na ndi amuma no ebe
ahu. Umunne gi, ha too nti n’ala na nkuzi
Mosisi na nke ndi amuma.’ Ma ogaranya ahu
zara: ‘Nna m Ebraham, mba nke ahu agaghi ezu!
A sin a e nwee onye si na ala mmuo gaa, gwa ha
okwu, ha ga-echeghari.’ Ma Ebreham, zara ya:
‘O buru na ha anughi nke Mosis na ndi amuma
kwuru, echeghi m na ha ga-echeghari ma
mmadu site n’onwu bilie bia gwa ha okwu.
Ozioma nke Oseburuwa.
Otito diri Gi, Kristi.
EKPERE NHUNYE
Chineke Onye ebere, nara onynye anyi na-
ebutere Gi. Biko mee ka o megheere anyi uzo
ebe ngozi Gi nile si abiara anyi. Site na Kristi
Onyenweanyi.
EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Onyenweanyi, biko mee ka ahu na obara Nwa
Gi nke anyi ji akwu ugwo maka njo anyi buuru
anyi ihe nzoputa nke ahu na mkpuruobi. Ka
anyi soro keta oke n’otito Ya, ebe anyi so na-
ekwuputa onwu Ya n’uwa a. Site na Kristi
Dinwenu anyi.
LAZARUS AND DIVES, THE RICH MAN
The story of Lazarus and Dives, the rich man is not something strange and new to us. Often times, people look at it as something that happened far away in a distance town and in ancient time but we have many Lazarus and Dives around us. We tend to ignore and look the other way
when we see our neighbors go through hard times and needs some support from us. We become Dives due to our stingy and miserly attitude towards our siblings, friends and
colleagues. We are too engrossed with feasting and gallivanting with our club members and those who are in our socialite life. Those who have all the fun in the world now should not
expect to inherit the kingdom of heaven and continue their luxurious life style. People steal from others and extort them in other to enrich themselves and engage in merry making. The love of money is the root of all evils. (1Tim6:10) This is rightly so as we see people engage in
fraud, do drugs and do dirty deals in order to become rich. If God bless us with wealth He expects us to use our wealth to serve others and help the many Lazarus around us. "Be
generous to the poor orphans and those in need. The man to whom our Lord has been liberal ought not to be stingy. We shall one day find in Heaven as much rest and joy as we ourselves
have dispensed in this life." Saint Ignatius. May God help us to be willing to share our resources with those who come to us for help.
Happy Sunday!!
Produced by ICC Choir